ONYE OKE ECHICHE Ọnọdụ jọọ njọ, ya adị gị ka ọ gaghị emecha dịzie. Ị nọrọ n'ụkọ, ya adị gị ka ụwa omebiwo. Ị nọrọ n'ọrịa, ya adị gị ka ajụrụ gị ajụ. I wee chefuo na ọ dịghị ọnọdụ na adịgide. Ihe m ma bụ na emee elu, emee ala, ọ ga adịrịrị onye ezi omume mma. Ọ dịghị ihe nwere mmalite na enweghị ọgụgụ. Ọ dịghị nsogbu na enweghị njedebe. Ọ dịghị abalị na enweghị ụtụtụ. Onye Oke Echiche, Kwụsị iche echiche. Ọ gaghị enyere gị aka. Kama, ọ ga ezu ohi udo gị, mee ka obi gị jupụta n'ụjọ, ma mee ka ị c…